Ebe Ndịàmà Jehova Na-edebe Ihe n’Ịntanet

Mmalite Beliefs Future Medical Topics Contact Us Publications Languages

Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?

Isiokwu na-esonụ

Ha nwere mmasị
n’ebe ị nọ

Ole Ndị Ka Ha Bụ?

Ọ BỤ̣ ọchịchọ Ndịàmà Jehova ka ị marakwuo ndị ha bụ nke ọma. Ọ pụrụ ịbụ na i zutewo ha dị ka ndị agbata obi na ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ n’ihe omume ndị ọzọ a na-eme kwa ụbọchị. Ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo ha n’okporo ámá ka ha na-enye ndị na-agafe n’ụzọ magazin ha. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ịbụ na gị na ha ekwurịtawo okwu ná mkpirikpi n’ọnụ ụzọ gị.

N’eziokwu, Ndịàmà Jehova nwere mmasị n’ebe ị nọ na n’ọdịmma gị. Ha chọrọ ịbụ ndị enyi gị na ịkọkwuru gị ihe banyere onwe ha, nkwenkwe ha, nzukọ ha, na ihe ha na-eche banyere ndị mmadụ na ụwa nke anyị nile bi n’ime ya. Iji mezuo nke a, ha akwadebewo broshuọ a maka gị.

N’ọtụtụ ụzọ, Ndịàmà Jehova dị ka ndị ọ bụla ọzọ. Ha nwere nsogbu ndị a na na-enwekarị—nke akụ̀ na ụba, nke anụ ahụ, na nke mmetụta uche. Ha na-emehie ihe mgbe ụfọdụ, n’ihi na ha abụghị ndị zuru okè, mmụọ nsọ adịghị agwa ha okwu, ha abụghịkwa ndị na-apụghị imehie emehie. Ma ha na-agbalị ịmụta ihe site n’ahụmahụ ha ma jiri ịdị uchu na-amụ Bible iji mee mgbanwe ndị dị mkpa. Ha ararawo onwe ha nye Chineke ime uche ya, ha na-etinyekwa ike ha nile n’imezu nraranye a. Ha na-achọ nduzi site n’Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya n’ihe nile ha na-eme.

Ha raara onwe ha nye Chineke ime uche ya

Ọ dị ha oké mkpa ka nkwenkwe ha dabere na Bible ọ bụghị n’ịkọ nkọ efu nke ụmụ mmadụ ma ọ bụ n’ụkpụrụ okwukwe okpukpe. Ha na-enwe mmetụta yiri nke Pọl onyeozi mgbe o kwupụtara echiche ya site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ka ọ pụta ìhè na Chineke bụ Onye eziokwu, ma mmadụ nile n’otu n’otu bụ ndị ụgha.” (Ndị Rom 3:4, Bible Nsọ nke Union Version*) Mgbe a bịara n’ihe ndị e ziri dị ka eziokwu Bible, Ndịàmà kwadosiri ike ihe ndị Beria mere mgbe ha nụrụ nkwusa Pọl onyeozi: “Ha weere obi dị ọkụ nile nara okwu ahụ nke ọma, na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a [ha] dị otú a.” (Ọrụ 17:11) Ndịàmà Jehova kweere na e kwesịrị isi otú a nyochaa ozizi okpukpe nile ma ha kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ, ma ọ bụ ha kụziri ha ma ọ bụ ndị ọzọ. Ha na-akpọ gị òkù—na-agba gị ume—ime nke a ná nkwurịta okwu gị na ha.

Ha kweere na Bible bụ Okwu Chineke

Site na nke a, o doro anya na Ndịàmà Jehova kweere na Bible, dị ka Okwu Chineke. Ha na-ewere akwụkwọ 66 dị n’ime ya dị ka ndị sitere n’ike mmụọ nsọ, ziekwa ezie n’akụkọ ihe mere eme ha. Ha na-ezo aka n’ihe a na-akpọkarị Agba Ọhụrụ dị ka Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ha na-akpọkwa Agba Ochie Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ha na-adabere na ha abụọ, n’Akwụkwọ Nsọ Grik na nke Hibru, ha na-ewerekwa ha dị ka e si dee ha ọ gwụla ebe o doro anya na ihe ndị e kwuru ma ọ bụ ọnọdụ a nọ kwuo okwu na-egosi na ha bụ ihe atụ. Ha na-aghọta na ọtụtụ amụma ndị dị na Bible emezuwo, ndị ọzọ nọ na-emezu, ma ndị ọzọ ka na-echere mmezu ha.

AHA HA

Ọ̀ bụ Ndịàmà Jehova? Ee, ọ bụ ihe ha na-akpọ onwe ha. Ọ bụ aha na-akọwa mmadụ, na-egosi na ha na-agba àmà banyere Jehova, ịbụ Chineke ya, na nzube ya. “Chineke,” “Onyenwe anyị,” na “Onye Okike” bụ utu aha—dị ka “President,” “Eze,” na “Ọchịagha” bụ—ụmụ mmadụ ndị a ma ama pụkwara ịza ha. Ma “Jehova” bụ aha aka ma na-ezo aka n’ebe Chineke pụrụ ime ihe nile na Onye Okike nke eluigwe na ala nọ. E gosiri nke a n’Abụ Ọma 83:18, dị ka nsụgharị King James nke Bible si kwuo: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, nanị onye aha ya bụ JEHOVA, bụ onye kasị elu n’elu ụwa nile.”

Aha aka Chineke n’asụsụ Hibru oge ochie

Aha ahụ bụ́ Jehova (ma ọ bụ Yahweh, dị ka nke Jerusalem Bible nke Roman Katọlik na ndị ọkà mmụta ụfọdụ ka nwee mmasị na ya) pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mbụ. Ihe ka ọtụtụ na Bible edeghị ya otú ahụ kama ha ji “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe anyị” dochie anya ya. Otú ọ dị, ọbụna n’ime Bible ndị a, ọtụtụ mgbe mmadụ pụrụ ịhụ ebe ihe odide mbụ nke Hibru ji Jehova mee ihe n’ihi na n’ebe ndị ahụ, e ji mkpụrụ akwụkwọ ukwu ndị buru ibu na mkpụrụ akwụkwọ ukwu ndị dị ntakịrị dee okwu nnọchianya ndị ahụ, otú a: CHINEKE, ONYENWE ANYỊ. Ọtụtụ nsụgharị nke oge a na-eji aha ahụ bụ́ Jehova ma ọ bụ Yahweh eme ihe. N’ihi ya, New World Translation na-agụ n’Aịsaịa 42:8, sị: “Abụ m Jehova. Nke ahụ bụ aha m.”

Aha ahụ dị ka e si kpọọ ya n’ụlọikpe

Ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ Ndịàmà Jehova si na ya nweta aha ha dị n’isi nke 43 nke Aịsaịa. N’ebe ahụ, e weere ụwa dị ka ụlọikpe: A kpọrọ chi nke mba dị iche iche òkù ka ha kpọta ndị akaebe ha iji kwado nzọrọ ha na-eme banyere ime ezi omume, ma ọ bụkwanụ ka ha nụrụ olu ndị àmà na-akwado Jehova ma kweta ihe bụ́ eziokwu. Jehova kwupụtara n’ebe ahụ gwa ndị ya, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara: ka unu wee mara, kwere m, ghọta na Mụ onwe m bụ Onye ahụ: ọ dịghị chi ọzọ e buru Mụ onwe m ụzọ kpụọ, ọ dịghịkwa nke ga-eso m n’azụ. Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Jehova; ọ dịghịkwa onye nzọpụta dị ma ọ bụghị nanị m.”—Aịsaịa 43:10, 11, American Standard Version.

Jehova Chineke nwere ndị àmà n’ụwa n’ọtụtụ puku afọ gaferenụ tupu a mụọ Jisọs. Mgbe Ndị Hibru isi 11 gosipụtasịrị aha ndị ụfọdụ nwere okwukwe, Ndị Hibru isi 12 na-ekwu, sị: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.” Jisọs nọ n’ihu Pọntịọs Paịlet kwuo, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” A na-akpọ ya “Onyeàmà ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke bụkwa Onye eziokwu.” (Jọn 18:37; Mkpughe 3:14) Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworịị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judịa na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.

N’ihi ya, ihe dị ka mmadụ 6,000,000 taa, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Jehova sitere n’aka Kraịst Jisọs n’ihe karịrị ala 230 na-eche na ha kwesịrị ekwesị ịkpọ onwe ha Ndịàmà Jehova.

Ihe dị ka Ndịàmà dị 6,000,000 n’ihe karịrị ala 230


* Nhota Bible nile e mere na broshuọ a sitere na nsụgharị a, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a, ọ gwụlakwa ma e gosiri nsụgharị ọzọ. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na nsụgharị ahụ sitere na New World Translation of the Holy Scriptures—With References nke dị n’asụsụ Bekee.

 

E Bipụtara Ya na 2000

MmaliteN’eluIsiokwu na-esonụ