Ebe Ndịàmà Jehova Na-edebe Ihe n’Ịntanet

Mmalite Beliefs Future Medical Topics Contact Us Publications Languages

Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?

Isiokwu bu ụzọIsiokwu na-esonụ

Gịnị Ka Ha Kweere?

NDỊÀMÀ JEHOVA kweere na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, Onye Okike nke eluigwe na ụwa. Ọdịdị nke ihe ndị dị ebube e mere n’ụzọ dị mgbagwoju anya dị n’eluigwe na n’ụwa nke gbara anyị gburugburu na-egosi n’ụzọ ezi uche dị na ya na Onye Okike kasị nwee ọgụgụ isi ma dị ike mere ha nile. Dị nnọọ ka ọrụ ndị ikom na ndị inyom na-egosi àgwà ha, otú ahụ ka ndị nke Jehova Chineke na-egosi àgwà ya. Bible na-agwa anyị na “ihe Ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke.” Ọzọkwa, n’ekwughị okwu, “eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke.”—Ndị Rom 1:20; Abụ Ọma 19:1-4

ỤWA . . . nke Jehova kere . . . nke mmadụ na-elekọta . . . nke a ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi

Ndị mmadụ adịghị akpụ ite ma ọ bụ mepụta telivishọn na kọmputa n’enweghị nzube ha ji mee ha. Ụwa na ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ e kere eke ndị dị n’ime ya dị nnọọ ebube karị. Ọdịdị nke ahụ mmadụ na puku ijeri mkpụrụ ndụ dị n’ime ya karịrị nghọta anyị—ọbụna ụbụrụ, nke anyị ji eche echiche bụ ihe dị ebube n’ụzọ karịrị nghọta! Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ nwere nzube ha ji emepụta ihe ndị ahụ dị ntakịrị ná ntụnyere, bụ́ ndị ha mepụtara, n’ezie, Jehova Chineke nwere nzube o ji kee ihe ndị dị egwu o kere! Ilu 16:4 na-ekwu na “Jehova kpụrụ ihe nile n’ihi Onwe ya.”


Jehova nwere nzube o ji kee ụwa, dị ka ọ gwara di na nwunye mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa . . . , nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) N’ihi na ha nupụrụ isi, di na nwunye a ejighị ezinụlọ ezi omume mejupụta ụwa, bụ́ ndị ga-eji ịhụnanya lekọta ụwa na ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ ndị dị n’ime ya. Ma ọdịda ha dara emebighị nzube Jehova. Ọtụtụ puku afọ mgbe e mesịrị, e dere, sị: “Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya . . . , ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya.” Ọ bụ “ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” A gaghị ebibi ya, kama “ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 45:18; Eklisiastis 1:4, The New English Bible) A ga-emezu nzube Jehova banyere ụwa, ọ sịrị: “Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.”—Aịsaịa 46:10.

N’ihi ya, Ndịàmà Jehova kweere na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi nakwa na mmadụ nile, ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ga-eme ihe kwekọrọ ná nzube Jehova maka ụwa e mere ka ọ maa mma, nke mmadụ ga-ebijupụta, pụrụ ibi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ihe nile a kpọrọ mmadụ ketara ezughị okè site n’aka Adam na Iv, n’ihi ya kwa, ha bụ ndị mmehie. (Ndị Rom 5:12) Bible na-agwa anyị, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ndị Rom 6:23; Eklisiastis 9:5; Ezikiel 18:4, 20) Mgbe ahụ, olee otú ha pụrụ isi dị ndụ ọzọ iji kere òkè ná ngọzi ndị ahụ ga-abịa n’ụwa? Ọ bụ nanị site n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jisọs, n’ihi na ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” “Ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29; 11:25; Matiu 20:28.

Olee otú nke a ga-esi mee? A kọwara ya ‘n’ozi ọma nke alaeze ahụ,’ nke Jisọs malitere ikwusa mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 4:17-23) Ma taa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ pụrụ iche.

IHE NDỊÀMÀ JEHOVA KWEERE

Nkwenkwe Ihe Ndabere Akwụkwọ Nsọ
Bible bụ Okwu Chineke, ọ bụkwa eziokwu 2 Tim. 3:16, 17; 2 Pita 1:20, 21; Jọn 17:17
A pụrụ ịdabere na Bible karịa n’ọdịnala Mat. 15:3; Kọl. 2:8
Aha Chineke bụ Jehova Abụ Ọma 83:18; Aịsa. 26:4; 42:8; Ọpụ. 6:3
Kraịst bụ Ọkpara Chineke, ọ dịkwa ala karịa Ya Mat. 3:17; Jọn 8:42; 14:28; 20:17; 1 Kọr. 11:3; 15:28
Kraịst bụ ihe mbụ Chineke kere Kọl. 1:15; Mkpu. 3:14
Kraịst nwụrụ n’elu osisi, ọ bụghị n’elu obe Gal. 3:13; Ọrụ 5:30
A kwụrụ ndụ mmadụ nke Kraịst dị ka ihe mgbapụta maka ụmụ mmadụ na-erube isi Mat. 20:28; 1 Tim. 2:5, 6; 1 Pita 2:24
Otu àjà Kraịst chụrụ zuru Rom 6:10; Hib. 9:25-28
A kpọlitere Kraịst n’ọnwụ dị ka onye bụ́ mmụọ nke na-adịghị anwụ anwụ 1 Pita 3:18; Rom 6:9; Mkpu. 1:17, 18
Ọnụnọ Kraịst bụ ná mmụọ Jọn 14:19; Mat. 24:3; 2 Kọr. 5:16; Abụ Ọma 110:1, 2
Anyị nọ ugbu a ‘n’oge ọgwụgwụ’ Mat. 24:3-14; 2 Tim. 3:1-5; Luk 17:26-30
Alaeze nke dị n’okpuru Kraịst ga-achị ụwa n’ezi omume na n’udo Aịsa. 9:6, 7; 11:1-5; Dan. 7:13, 14; Mat. 6:10
Alaeze ahụ ga-eweta ọnọdụ ibi ndụ dị mma n’ụwa Abụ Ọma 72:1-4; Mkpu. 7:9, 10, 13-17; 21:3, 4
Ọ dịghị mgbe a ga-ebibi ụwa ma ọ bụ mee ka ọ tọgbọrọ n’efu Ekli. 1:4; Aịsa. 45:18; Abụ Ọma 78:69
Chineke ga-ebibi usoro ihe dị ugbu a n’agha Ha-Magedọn Mkpu. 16:14, 16; Zef. 3:8; Dan. 2:44; Aịsa. 34:2; 55:10, 11
A ga-ebibi ndị ajọ omume ruo mgbe ebighị ebi Mat. 25:41-46; 2 Tesa. 1:6-9
Ndị Chineke nwapụtara ga-enweta ndụ ebighị ebi Jọn 3:16; 10:27, 28; 17:3; Mak 10:29, 30
E nwere nanị otu ụzọ nke na-eduga ná ndụ Mat. 7:13, 14; Efe. 4:4, 5
Ọnwụ ụmụ mmadụ bụ n’ihi mmehie Adam Rom 5:12; 6:23
Mkpụrụ obi mmadụ na-akwụsị ịdị ndụ mgbe mmadụ nwụru Ezik. 18:4; Ekli. 9:10; Abụ Ọma. 6:5; 146:4; Jọn 11:11-14
Hel bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ Job 14:13, Dy; Mkpu. 20:13, 14, AV (etiti peeji)
Olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ bụ mbilite n’ọnwụ 1 Kọr. 15:20-22; Jọn 5:28, 29; 11:25, 26
Ọnwụ sitere n’aka Adam ga-akwụsị 1 Kọr. 15:26, 54; Mkpu. 21:4; Aịsa. 25:8
Nanị ìgwè atụrụ nta dị 144,000 ga-aga eluigwe ma soro Kraịst chịa Luk 12:32; Mkpu. 14:1, 3; 1 Kọr. 15:40-53; Mkpu. 5:9, 10
A na-amụ 144,000 ahụ ọzọ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke 1 Pita 1:23; Jọn 3:3; Mkpu. 7:3, 4
E so Israel ime mmụọ gbaa ọgbụgba ndụ ọhụrụ Jer. 31:31; Hib. 8:10-13
E wukwasịrị nzukọ Kraịst n’elu ya onwe ya Efe. 2:20; Aịsa. 28:16; Mat. 21:42
Nanị Jehova ka a ga-ekpegara ekpere site na Kraịst Jọn 14:6, 13, 14; 1 Tim. 2:5
E kwesịghị iji ihe oyiyi na-efe ofufe Ọpụ. 20:4, 5; Lev. 26:1; 1 Kọr. 10:14; Abụ Ọma 115:4-8
A ghaghị izere mgbaasị Deut. 18:10-12; Gal. 5:19-21; Lev. 19:31
Setan bụ onye ọchịchị a na-adịghị ahụ anya nke ụwa 1 Jọn 5:19; 2 Kọr. 4:4; Jọn 12:31
Onye Kraịst ekwesịghị ikere òkè ọ bụla n’ihe omume ngwakọta ofufe 2 Kọr. 6:14-17; 11:13-15; Gal. 5:9; Deut. 7:1-5
Onye Kraịst kwesịrị ịnọpụ iche n’ụwa Jes. 4:4; 1 Jọn 2:15; Jọn 15:19; 17:16
Rubere iwu ụmụ mmadụ isi bụ́ ndị na-emegideghị iwu Chineke Mat. 22:20, 21; 1 Pita 2:12; 4:15
Isi n’ọnụ ma ọ bụ n’akwara mịnye ọbara n’ahụ na-emegide iwu Chineke Jen. 9:3, 4; Lev. 17:14; Ọrụ 15:28, 29
A ghaghị irube isi n’iwu Bible banyere omume 1 Kọr. 6:9, 10; Hib. 13:4; 1 Tim. 3:2; Ilu 5:1-23
Nanị ndị Israel ka e nyere iwu idebe ụbọchị izu ike, o sokwa Iwu Mosis kwụsị Deut. 5:15; Ọpụ. 31:13; Rom 10:4; Gal. 4:9, 10; Kọl. 2:16, 17
Òtù ndị ụkọchukwu na utu aha pụrụ iche ekwesịghị ekwesị Mat. 23:8-12; 20:25-27; Job 32:21, 22
Mmadụ arịpụtaghị arịpụta kama e kere ya eke Aịsa. 45:12; Jen. 1:27; Mat. 19:4
Kraịst setịpụrụ ihe nlereanya a na-aghaghị ịgbaso n’ijere Chineke ozi 1 Pita 2:21; Hib. 10:7; Jọn 4:34; 6:38
Ime baptism site n’imikpu kpam kpam n’ime mmiri na-egosipụta nraranye Mak 1:9, 10; Jọn 3:23; Ọrụ 19:4, 5
Ndị Kraịst ji obi ụtọ na-agba akaebe n’ihu ọha maka eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ Rom 10:10; Hib. 13:15; Aịsa. 43:10-12
 

E Bipụtara Ya na 2000

MmaliteN’eluIsiokwu bu ụzọIsiokwu na-esonụ