Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? |
Gịnị Ka Ha Kweere?NDỊÀMÀ JEHOVA kweere na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, Onye Okike nke eluigwe na ụwa. Ọdịdị nke ihe ndị dị ebube e mere n’ụzọ dị mgbagwoju anya dị n’eluigwe na n’ụwa nke gbara anyị gburugburu na-egosi n’ụzọ ezi uche dị na ya na Onye Okike kasị nwee ọgụgụ isi ma dị ike mere ha nile. Dị nnọọ ka ọrụ ndị ikom na ndị inyom na-egosi àgwà ha, otú ahụ ka ndị nke Jehova Chineke na-egosi àgwà ya. Bible na-agwa anyị na “ihe Ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke.” Ọzọkwa, n’ekwughị okwu, “eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke.”—Ndị Rom 1:20; Abụ Ọma 19:1-4
Ndị mmadụ adịghị akpụ ite ma ọ bụ mepụta telivishọn na kọmputa n’enweghị nzube ha ji mee ha. Ụwa na ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ e kere eke ndị dị n’ime ya dị nnọọ ebube karị. Ọdịdị nke ahụ mmadụ na puku ijeri mkpụrụ ndụ dị n’ime ya karịrị nghọta anyị—ọbụna ụbụrụ, nke anyị ji eche echiche bụ ihe dị ebube n’ụzọ karịrị nghọta! Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ nwere nzube ha ji emepụta ihe ndị ahụ dị ntakịrị ná ntụnyere, bụ́ ndị ha mepụtara, n’ezie, Jehova Chineke nwere nzube o ji kee ihe ndị dị egwu o kere! Ilu 16:4 na-ekwu na “Jehova kpụrụ ihe nile n’ihi Onwe ya.”
Jehova nwere nzube o ji kee ụwa, dị ka ọ gwara di na nwunye mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa . . . , nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) N’ihi na ha nupụrụ isi, di na nwunye a ejighị ezinụlọ ezi omume mejupụta ụwa, bụ́ ndị ga-eji ịhụnanya lekọta ụwa na ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ ndị dị n’ime ya. Ma ọdịda ha dara emebighị nzube Jehova. Ọtụtụ puku afọ mgbe e mesịrị, e dere, sị: “Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya . . . , ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya.” Ọ bụ “ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” A gaghị ebibi ya, kama “ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 45:18; Eklisiastis 1:4, The New English Bible) A ga-emezu nzube Jehova banyere ụwa, ọ sịrị: “Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.”—Aịsaịa 46:10.
N’ihi ya, Ndịàmà Jehova kweere na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi nakwa na mmadụ nile, ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ga-eme ihe kwekọrọ ná nzube Jehova maka ụwa e mere ka ọ maa mma, nke mmadụ ga-ebijupụta, pụrụ ibi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ihe nile a kpọrọ mmadụ ketara ezughị okè site n’aka Adam na Iv, n’ihi ya kwa, ha bụ ndị mmehie. (Ndị Rom 5:12) Bible na-agwa anyị, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ndị Rom 6:23; Eklisiastis 9:5; Ezikiel 18:4, 20) Mgbe ahụ, olee otú ha pụrụ isi dị ndụ ọzọ iji kere òkè ná ngọzi ndị ahụ ga-abịa n’ụwa? Ọ bụ nanị site n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jisọs, n’ihi na ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” “Ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29; 11:25; Matiu 20:28. Olee otú nke a ga-esi mee? A kọwara ya ‘n’ozi ọma nke alaeze ahụ,’ nke Jisọs malitere ikwusa mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 4:17-23) Ma taa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ pụrụ iche. | ||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||
IHE NDỊÀMÀ JEHOVA KWEERE
| ||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||||
E Bipụtara Ya na 2000 |