Ebe Ndịàmà Jehova Na-edebe Ihe n’Ịntanet

Mmalite Beliefs Future Medical Topics Contact Us Publications Languages

Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?

Isiokwu bu ụzọ

Òkù Anyị Na-akpọ Gị

Anyị enwewo obi ụtọ ịgwa gị okwu site na broshuọ a. Anyị nwere olileanya na ọ tọwo gị ụtọ ịmatakwu banyere Ndịàmà Jehova. Biko nabata ọkpụkpọ òkù anyị na-akpọ gị ileta anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị n’ógbè gị. Hụ otú e si eduzi nzukọ anyị. Hụrụ otú anyị si agbalịsi ike isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma banyere paradaịs elu ala n’okpuru Alaeze Kraịst.

Chineke ekwewo nkwa maka ya. “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Ọtụtụ narị afọ agafewo. Oge nchere ahụ na-abịa ná njedebe. Ọnọdụ ndị dị n’ụwa na-egosi nke a.

“N’ụzọ ha ka unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso,” ka Pọl onyeozi kwuru ‘na-atụgharịtakwanụ uche n’ahụ ibe unu ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) Anyị na-akpọ gị òkù ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl site n’isoro anyị na-ezukọ.

Ọ̀ ga-amasị gị ka mmadụ bịa na nke gị?

 

E Bipụtara Ya na 2000

MmaliteN’eluIsiokwu bu ụzọ