Ebe Ndịàmà Jehova Na-edebe Ihe n’Ịntanet

Mmalite Beliefs Future Medical Topics Adres Anyị Publications Languages
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ihe Ọmụmụ nke 1Isiokwu bu ụzọIsiokwu na-esonụ

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Chọpụta Ihe Chineke Na-achọ

Ihe ọmụma dị aṅaa dị mkpa dị n’ime Bible? (1)
Ònye chepụtara Bible? (2)
N’ihi gịnị ka ị ga-eji mụọ Bible? (3)

1. Bible bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke. Ọ dị ka akwụkwọ ozi nke nna na-ahụ n’anya nye ụmụ ya. Ọ na-agwa anyị eziokwu banyere Chineke—onye ọ bụ na ihe ụkpụrụ ya bụ. Ọ na-akọwa ụzọ isi nagide nsogbu na ụzọ isi chọta ezi obi ụtọ. Nanị Bible na-agwa anyị ihe anyị na-aghaghị ime iji mee Chineke obi ụtọ.—Abụ Ọma 1:1-3; Aịsaịa 48:17, 18.

2. Ihe dị ka ndị ikom 40 dere Bible n’ihe karịrị ogologo oge nke 1,600 afọ, malite na 1513 T.O.A. Ihe mejupụtara ya bụ 66 akwụkwọ nta dị iche iche. Chineke nyere ndị dere Bible ike mmụọ nsọ. Ha dere uche ya, ọ bụghị nke ha. Ya mere Chineke n’eluigwe, ọ bụghị mmadụ ọ bụla n’elu ala, bụ Onye Chepụtara Bible.—2 Timoti 3:16, 17; 2 Pita 1:20, 21.

3. Chineke hụrụ na e depụtaghachiri Bible ma chebekwa ya nke ọma. E bipụtawo ọtụtụ Bible karịa akwụkwọ ọzọ. Ọ bụghị mmadụ nile ga-enwe obi ụtọ ịhụ gị ka ị na-amụ Bible, ma ekwela ka nke ahụ kwụsị gị. Ọdịnihu ebighị ebi gị dabeere na gị ịmara Chineke na ime uche ya n’agbanyeghị mmegide ọ bụla.—Matiu 5:10-12; Jọn 17:3.

 

E Bipụtara Ya na 1996

MmaliteN’eluIsiokwu bu ụzọIsiokwu na-esonụ

Copyright © 2010 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. All rights reserved.