| Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? | Ihe Ọmụmụ nke 2 |
Ònye Bụ Chineke? |
|
| Ònye bụ ezi Chineke ahụ, gịnịkwa bụ aha ya? (1, 2) | |
| Ụdị ahụ dị aṅaa ka o nwere? (3) | |
| Gịnị bụ àgwà ya ndị pụtara ìhè? (4) | |
| Ànyị kwesịrị iji onyinyo na ihe oyiyi fee ya ofufe? (5) | |
| Olee ụzọ abụọ anyị pụrụ isi mụta banyere Chineke? (6) | |
1. Ndị mmadụ na-efe ọtụtụ ihe ofufe. Ma Bible na-agwa anyị na e nwere nanị otu EZI Chineke. O kere ihe nile dị n’eluigwe na n’elu ala. N’ihi na o nyere anyị ndụ, nanị ya bụ Onye anyị kwesịrị ife ofufe.—1 Ndị Kọrint 8:5, 6; Mkpughe 4:11.
2. Chineke nwere ọtụtụ utu aha ma nwee nanị otu aha. Aha ahụ bụ JEHOVA. N’ihe ka n’ọtụtụ Bible, e wepụwo aha Chineke ma jiri utu aha bụ ONYENWE ANYỊ ma ọ bụ CHINEKE dochie ya. Ma mgbe e dere Bible, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara n’ime ya ihe dị ka 7,000 ugboro!—Ọpụpụ 3:15; Abụ Ọma 83:18. 3. Jehova nwere ahụ, ma ọ dịghị ka nke anyị. “Chineke bụ Mmụọ,” ka Bible na-ekwu. (Jọn 4:24) Mmụọ bụ ọdịdị nke ndụ nke dị elu nke ukwuu karịa nke anyị. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke hụworo Chineke anya mgbe ọ bụla. Jehova bi n’eluigwe, ma ọ pụrụ ịhụ ihe nile. (Abụ Ọma 11:4, 5; Jọn 1:18) Ma, gịnị bụ mmụọ nsọ? Ọ bụghị onye dị ka Chineke. Kama nke ahụ, ọ bụ ike ọrụ Chineke.—Abụ Ọma 104:30. 4. Bible na-ekpughe ụdị onye Jehova bụ nye anyị. Ọ na-egosi na àgwà ya ndị pụtara ìhè bụ ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike. (Deuterọnọmi 32:4; Job 12:13; Aịsaịa 40:26; 1 Jọn 4:8) Bible na-agwa anyị na ọ dịkwa obi ebere, obi ọma, na-agbaghara mmehie, na-emesapụ aka, nweekwa ndidi. Anyị, dị ka ụmụ na-erube isi, kwesịrị ịgbalị iṅomi ya.—Ndị Efesọs 5:1, 2.
5. Ànyị kwesịrị ịkpọ isiala ma ọ bụ kpee ekpere nye onyinyo, ihe osise, ma ọ bụ ihe oyiyi dị iche iche n’ofufe anyị? Ee e! (Ọpụpụ 20:4, 5) Jehova sịrị na anyị aghaghị ife nanị ya ofufe. Ọ gaghị esoro onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ kerịta otuto ya. Onyinyo enweghị ike ọ bụla inyere anyị aka.—Abụ Ọma 115:4-8; Aịsaịa 42:8. 6. Olee otú ị pụrụ isi mara Chineke nke ọma karị? Otu ụzọ bụ site n’ikiri ihe ndị o keworo na ichemi echiche banyere ihe ndị ha na-agwa anyị. Ihe okike Chineke na-egosi anyị na o nwere ike na amamihe dị ukwuu. Anyị na-ahụ ịhụnanya ya n’ihe nile o meworo. (Abụ Ọma 19:1-6; Ndị Rom 1:20) Ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi mụta banyere Chineke bụ site n’ịmụ Bible. N’ime ya ọ na-agwa anyị ọtụtụ ihe karị banyere ụdị Chineke ọ bụ. Ọ na-agwakwa anyị banyere nzube ya na ihe ọ chọrọ ka anyị mee.—Emọs 3:7; 2 Timoti 3:16, 17. |
|
E Bipụtara Ya na 1996 |
|
Copyright © 2010 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. All rights reserved. |
|