| Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? | Ihe Ọmụmụ nke 8 |
Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ |
|
| Gịnị bụ ọnọdụ nke di n’ime ezinụlọ? (1) | |
| Olee otú di kwesịrị isi mesoo nwunye ya? (2) | |
| Ibu ọrụ dịgasị aṅaa ka nna nwere? (3) | |
| Gịnị bụ ọrụ onye bụ nwunye n’ime ezinụlọ? (4) | |
| Gịni ka Chineke na-achọ n’aka ndị nne na nna na n’aka ụmụ? (5) | |
| Gịnị bụ echiche Bible banyere nkewa na ịgba alụkwaghịm? (6, 7) | |
1. Bible na-asị na di bụ isi nke ezinụlọ ya. (1 Ndị Kọrint 11:3) Di aghaghị inwe nanị otu nwunye. Ha kwesịrị ịbụ ndị gbara akwụkwọ otú kwesịrị ekwesị dị ka iwu si dị.—1 Timoti 3:2; Taịtọs 3:1. 2. Di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya. O kwesịrị imeso ya omume n’ụzọ Jisọs si emeso ụmụazụ ya. (Ndị Efesọs 5:25, 28, 29) O kwesịghị iti nwunye ya ihe ma ọlị ma ọ bụ megbuo ya n’ụzọ ọ bụla. Kama nke ahụ, o kwesịrị inye ya nsọpụrụ na nkwanye ùgwù.—Ndị Kọlọsi 3:19; 1 Pita 3:7.
3. Nna kwesịrị ịrụsi ọrụ ike iji lekọta ezinụlọ ya. Ọ ghaghị inye nwunye ya na ụmụ ya ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Nna aghaghịkwa imeju mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ya. (1 Timoti 5:8) Ọ na-ebute ụzọ n’inyere ezinụlọ ya aka ịmụta banyere Chineke na nzube Ya.—Deuterọnọmi 6:4-9; Ndị Efesọs 6:4. 4. Nwunye kwesịrị ịbụrụ di ya ezi onye inyeaka. (Jenesis 2:18) O kwesịrị inyere di ya aka n’ịkụziri ụmụ ha ihe na ịzụlite ha. (Ilu 1:8) Jehova na-achọ ka nwunye jiri ịhụnanya na-elekọta ezinụlọ ya. (Ilu 31:10, 15, 26, 27; Taịtọs 2:4, 5) O kwesịrị ịdị na-atụ egwu di ya.—Ndị Efesọs 5:22, 23, 33. 5. Chineke chọrọ ka ụmụ na-erubere nne na nna ha isi. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ na-atụ anya ka ndị nne na nna zie ụmụ ha ihe ma gbazie ha olu. Ọ dị ndị nne na nna mkpa iwepụta oge soro ụmụ ha nọkọọ ma mụọrọ ha Bible, na-egbo mkpa ime mmụọ na nke mmetụta uche ha. (Deuterọnọmi 11:18, 19; Ilu 22:6, 15) Ndị nne na nna ekwesịghị mgbe ọ bụla ịdọ ụmụ ha aka ná ntị n’ụzọ aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ.—Ndị Kọlọsi 3:21.
6. Mgbe di na nwunye nwere nsogbu nke enweghị nkwekọrịta, ha kwesịrị ịgbalị itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Bible na-agba anyị ume igosi ịhụnanya ma na-agbaghara. (Ndị Kọlọsi 3:12-14) Okwu Chineke adịghị agba ume iwere nkewa dị ka ụzọ isi dozie nsogbu ndị dị nta. Ma nwunye pụrụ ịhọrọ ịhapụ di ya ma ọ bụrụ na (1) o were isi ike jụ ịkwado ezinụlọ ya, (2) ọ na-eme ihe ike nke ukwuu nke na ndụ na ahụ ike ya nọ n’ihe ize ndụ, ma ọ bụ (3) mmegide ya gabigara ókè na-eme ya ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe ya omume ife Jehova.—1 Ndị Kọrint 7:12, 13. 7. Ndị di na nwunye aghaghị ikwesị ntụkwasị obi nye ibe ha. Ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye bụ mmehie megide Chineke na megide onye mmadụ lụrụ. (Ndị Hibru 13:4) Mmekọahụ na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye bụ nanị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm na-enye ohere maka nlụgharị. (Matiu 19:6-9; Ndị Rom 7:2, 3) Jehova na-akpọ ya asị mgbe ndị mmadụ na-agba alụkwaghịm n’enweghị nkwado Akwụkwọ Nsọ ma lụrụ onye ọzọ.—Malakaị 2:14-16. |
||||
E Bipụtara Ya na 1996 |
|
Copyright © 2008 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. All rights reserved. |
|