| Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? | Ihe Ọmụmụ nke 10 |
Omume Ndị Chineke Kpọrọ Asị |
|
| Olee mmetụta i kwesịrị inwe banyere ihe ndị Chineke sịrị na ha dị njọ? (1) | |
| Ụdị omume mmekọahụ ndị dị aṅaa dị njọ? (2) | |
| Olee otú onye Kraịst kwesịrị isi were ịgha ụgha? (3) ịgba chaa chaa? (3) izu ohi? (3) ime ihe ike? (4) mgbaasị? (5) ịṅụbiga mmanye ókè? (6) | |
| Olee otú mmadụ pụrụ isi tọhapụ onwe ya pụọ n’omume ọjọọ? (7) | |
1. Ndị na-ejere Chineke ozi na-ahụ ezi ihe n’anya. Ma ha aghaghịkwa ịmụta ịkpọ ihe ọjọọ asị. (Abụ Ọma 97:10) Nke ahụ pụtara izere omume ụfọdụ Chineke kpọrọ asị. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime omume ndị ahụ? 2. Ịkwa Iko: Mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, idina anụmanụ, mmekọahụ n’etiti ndị ikwu, na ndina ụdị onwe bụcha mmehie dị oké njọ megide Chineke. (Levitikọs 18:6; Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ bụrụ na mmadụ abụọ alụghị di na nwunye ma na-ebikọ ọnụ, ha kwesịrị ikewapụ ma ọ́ bụghị ya ha agbaa akwụkwọ dị ka iwu kwadoro.—Ndị Hibru 13:4.
3. Ịgha Ụgha, Ịgba Chaa Chaa, Izu Ohi: Jehova Chineke apụghị ikwu okwu ụgha. (Taịtọs 1:2) Ndị chọrọ nnwapụta ya aghaghị izere ịgha ụgha. (Ilu 6:16-19; Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ụdị ọ bụla nke ịgba chaa chaa bụ ihe anyaukwu merụworo. Ya mere ndị Kraịst adịghị ekere òkè n’ụdị ọ bụla nke ịgba chaa chaa, dị ka ịgba lọtrị, ọsọ ịnyịnya, na bingo. (Ndị Efesọs 5:3-5) Ndị Kraịst adịghịkwa ezu ohi. Ha adịghị akpachara anya zụrụ ihe e zuru n’ohi ma ọ bụ were ihe n’anataghị ikike.—Ọpụpụ 20:15; Ndị Efesọs 4:28. 4. Ọnụma, Ime Ihe Ike: Iwe a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ iduga n’ime ihe ike. (Jenesis 4:5-8) Onye na-eme ihe ike apụghị ịbụ enyi Chineke. (Abụ Ọma 11:5; Ilu 22:24, 25) Ọ bụ ihe na-adịghị mma ịbọ ọ́bọ̀ ma ọ bụ iji ihe ọjọọ akwụghachi ajọ ihe nke ndị ọzọ pụrụ ime anyị.—Ilu 24:29; Ndị Rom 12:17-21. 5. Ịkọ Ọgwụ na Mgbaasị: Ụfọdụ ndị na-akpọku ike ndị mmụọ iji gbalịa ịgwọ ọrịa. Ndị ọzọ na-akọ ndị iro ha ọgwụ iji mee ka ha daa ọrịa ma ọ bụ ọbụna iji gbuo ha. Ike dị n’azụ omume ndị a nile bụ Setan. Ya mere ndị Kraịst agaghị ekere òkè n’akụkụ nke ọ bụla n’ime ha. (Deuterọnọmi 18:9-13) Ịnọ Jehova nso bụ ihe nchebe kasị mma site n’ọgwụ ndị ọzọ pụrụ ịkọ anyị.—Ilu 18:10. 6. Ịṅụbiga Mmanya Ókè: Ọ dịghị njọ ịṅụ obere mmanya, biya, ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya. (Abụ Ọma 104:15; 1 Timoti 5:23) Ma ịṅụ oké mmanya na ịṅụbiga mmanya ókè dị njọ n’anya Chineke. (1 Ndị Kọrint 5:11-13; 1 Timoti 3:8) Ịṅụ mmanya nke ukwuu pụrụ imebi ahụ ike gị ma tisaa ezinụlọ gị. Ọ pụkwara ime ka ị daba ngwa ngwa n’ọnwụnwa ndị ọzọ.—Ilu 23:20, 21, 29-35. 7. Ndị na-eme ihe Chineke sịrị na ha dị njọ “agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galetia 5:19-21) Ọ bụrụ n’ezie na ị hụrụ Chineke n’anya ma chọọ ime ihe ga-atọ ya ụtọ, ị pụrụ inwere onwe gị pụọ n’omume ndị a. (1 Jọn 5:3) Mụta ịkpọ ihe Chineke sịrị na ọ di njọ asị. (Ndị Rom 12:9) Soro ndị nwere àgwà nsọpụrụ Chineke na-akpakọrịta. (Ilu 13:20) Mkpakọrịta nke ndị Kraịst tozuru okè pụrụ ịbụ isi iyi nke enyemaka. (Jemes 5:14) N’elu ihe nile, dabere n’enyemaka Chineke site n’ekpere.—Ndị Filipaị 4:6, 7, 13. |
||
E Bipụtara Ya na 1996 |
|
Copyright © 2008 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. All rights reserved. |
|