| Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? | Ihe Ọmụmụ nke 16 |
Mkpebi Gị Ijere Chineke Ozi |
|
| Gịnị ka ị na-aghaghị ime iji bụrụ enyi Chineke? (1, 2) | |
| Olee otú i si eme nraranye gị nye Chineke? (1) | |
| Olee mgbe e kwesịrị ime gị baptism? (2) | |
| Olee otú ị pụrụ isi nweta ike ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke? (3) | |
1. Iji bụrụ enyi Chineke, ị ghaghị inweta ihe ọmụma dị mma nke eziokwu Bible (1 Timoti 2:3, 4), itinye okwukwe n’ihe ndị ị mụtaworo (Ndị Hibru 11:6), ichegharị site ná mmehie gị (Ọrụ 17:30, 31), na ichigharị n’ụzọ ndụ gị. (Ọrụ 3:19) Mgbe ahụ ịhụnanya gị maka Chineke kwesịrị ịkwali gị ịrara onwe gị nye ya. Nke a pụtara na n’ekpere nanị gị, nke onwe onye ị na-agwa ya na ị na-enyefe ya onwe gị ime ihe ọ na-achọ.—Matiu 16:24; 22:37. 2. Mgbe ị mesịworo nraranye gị nye Chineke, o kwesịrị ka e mee gị baptism. (Matiu 28:19, 20) Baptism na-eme ka onye ọ bụla mara na ị rarawo onwe gị nye Jehova. Ya mere baptism bụ nanị maka ndị toruworo ogo ime mkpebi ijere Chineke ozi. Mgbe e mere mmadụ baptism, e kwesịrị imikpu ahụ ya nile n’ime mmiri ruo nwa oge.*—Mak 1:9, 10; Ọrụ 8:36. 3. Mgbe i mesịrị nraranye, Jehova ga-atụ anya n’aka gị ibi ndụ kwekọrọ ná nkwa gị. (Abụ Ọma 50:14; Eklisiastis 5:4, 5) Ekwensu ga-agbalị ịkwụsị gị ife Jehova ofufe. (1 Pita 5:8) Ma bịaruo Chineke nso n’ekpere. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Mụọ Okwu ya kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 1:1-3) Nọrọ ọgbakọ nso. (Ndị Hibru 13:17) Site n’ime ihe a nile, ị ga-enweta ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Ruo mgbe nile ebighị ebi ị pụrụ isi otú a mee ihe ndị Chineke na-achọ n’aka gị! Ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka e duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu? Detara Ndịàmà Jehova akwụkwọ n’adres kwesịrị ekwesị. Adres
|
||
E Bipụtara Ya na 1996 |
|
Copyright © 2008 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. All rights reserved. |
|